Proverbs 4

Amamihe Kachasị ihe niile

1Ụmụ m ndị ikom, geenụ ntị na ndụmọdụ nke nna unu,
lezienụ anya ka unu nwee nghọta.
2Ṅaanụ ntị, nwee uche, nʼihi na ọ bụ ezi ozizi ka m na-ezi unu;
ya mere, unu ahapụkwala iwu m.
3Mgbe m bụ nwantakịrị nʼụlọ nna m,
mgbe m ka dị ntakịrị, bụrụkwa naanị otu nwa nne m ji,
4ọ ziri m ihe, sịkwa m,
“Ka obi gị jidesie okwu m niile ike,
debe nʼiwu niile, ị ga-adịkwa ndụ.
5Nweta amamihe, nwetakwa nghọta,
echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị.
6Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị,
hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị.
7Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe,
ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.
8Ọ bụrụ na i bulie amamihe elu, o ga-ebulikwa gị elu.
Jidesie ya ike, ọ ga-ewetara gị oke nsọpụrụ.
9Ọ ga-eji okpueze okoko osisi chọọ isi gị mma
nyekwa gị okpueze mara mma nʼisi gị.”

10Nwa m, ṅaa m ntị, meekwa ihe m gwara gị;
ị ga-enwekwa ndụ ogologo.
11M ga-edu gị nʼụzọ nke amamihe,
duokwa gị nʼụzọ ziri ezi.
12Ọ bụrụ na i bie ụdị ndụ dị otu a, ihe agaghị akpọ gị nʼụkwụ nʼije gị,
ị gaghị asụkwa ngọngọ mgbe ị na-agba ọsọ.
13Mee ihe niile m gwara gị, echefukwala ha,
nʼihi na ọ ga-eduba gị na ndụ zuruoke.
14Emela dịka ndị na-emebi iwu.
Esokwala ụzọ ha.
15Zeere ha, ejekwala nʼụzọ ha;
chepu ihu gị nʼụzọ ahụ,
16nʼihi na ndị na-emebi iwu adịghị arahụ ụra tutu ha emee arụ nke ụbọchị ahụ.
Ha anaghị ezu ike tutu ha emee ka otu onye maa nʼọnya.
17Ha na-eri ihe oriri nke mmebi iwu,
na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ nke ọgbaaghara.

18Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ,
nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị.
19Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị,
ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.

20Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu.
Gee ntị nke ọma.
21Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile;
ka ha bamiekwa nʼime obi gị,
22nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha,
bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ.
23Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya,
nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.
24Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta;
kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị.
25Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu;
atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.
26Leruo ije ụkwụ gị anya,
doziekwa ụzọ gị niile ka ọ guzozie.
27Ewezugala onwe gị site nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe;
si nʼihe ọjọọ wezuga ụkwụ gị.
Copyright information for IboBIU